
Nchọcha a bụ maka Ilu Igbo: Igosipụta ọnọdụ ụmụnwaanyị n’ọkwa ọchịchị n’ala Igbo. Ihe nwanchọcha bu n’obi bụ izipụta etu ndị Igbo si eji ilu dị iche iche ha ji achọ okwu mma ezipụta na ụmụnwaanyị enweghi ọnọdụ n’ọchịchị n’ala Igbo. Nkụ dị na mba na-eghere mba nri. Ndị Igbo na-esi n’ilu dị iche iche were ezipụtaomenala ha. A bị a n’ala Igbo, ụmụnwaanyị bụ ndị a na-eleda anya nke ukwuu n’ihe gbasara ọnọdụ ọchịchị obodo dị iche iche. Odee nyochara ọnọdụ ọchịchị n’ala Igbo bido n’oge ochie ruo ugbu a; o mere ka o doo anya na n’agbanyeghị na usoro ọchịchị Bekee mere ka onye ọbụla nwee nhatanha ọnụokwu n’usoro ọchịchị mba ọbụla, ọ ka bụ ihe siri ike ugbu a nwaanyị ijide ọkwa ọchịchị n’ala Igbo. Ihe ndị a na-apụta ihe site n’ilu ndị Igbo ji ekwu okwu. Ụfọdụ ilu ndị ahụ bụ ndị a: Nwaanyị lerịa di ya, ike akpọọ ya nkụ., Ụbọchị di nwaanyị nwụrụ ka ọnụ mmiri okwu ya gwụrụ. Odee gara n’ihu wee jụọ ihe a ga-eme iji hụ na onye ọbụla nwere nhatanha ọnụokwu n’ọchịchị ododo dị iche iche. Ka o sila dị, ọ kọwapụtara na e nweela mgbanwo pụtatra ihe n’etu ndị Igbo si elegara ụmụnwaanyị anya n’ihe gbasara ọchịchị . Nke a pụtara na ụmụnwaanyị ji nwayọọ nwayọọ na-abanye n’ọkwa ọchịchị dị iche iche ugbu a. English Abstract Igbo Proverbs: X -Ray of the position of women in leadership position in Igboland. The writer intends to manifest how the Igbos use their proverbs to show that women have no chance in Igbo leadership position. The research was guided by transformational theory of leadership. The researcher traced the history of Igboleadership system from the time prior to the advent of the colonial masters till the present age. It was discovered that the Igbos look down on women when it comes to major decision making. They manifest this attitude through the proverbs they use in their daily conversations. Some of those proverbs are Nwaanyị lerịa di ya, ike akpọọ ya nkụ.(If a woman kooks down on her husband she would have a dry buttocks) Ụbọchị di nwaanyị nwụrụ ka ọnụ mmiri okwu ya gwụrụ. (whenever a woman loses her husband, she loses her speep saliva). However, it was noticed that in the present age, women are gradually being recognized in decision making process among the Igbos. He finally advocates that gender should not prevent peoples’ participation in leadership. Every person should be equal before the law. As such, women should not be excluded from leadership position among the Igbo.
| selected citations These citations are derived from selected sources. This is an alternative to the "Influence" indicator, which also reflects the overall/total impact of an article in the research community at large, based on the underlying citation network (diachronically). | 1 | |
| popularity This indicator reflects the "current" impact/attention (the "hype") of an article in the research community at large, based on the underlying citation network. | Average | |
| influence This indicator reflects the overall/total impact of an article in the research community at large, based on the underlying citation network (diachronically). | Average | |
| impulse This indicator reflects the initial momentum of an article directly after its publication, based on the underlying citation network. | Average |
